Proverbs 2

Ịba uru nke amamihe

1Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile
zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,
2tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,
wepụta obi gị inwe nghọta.
3E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,
ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,
4ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha
maọbụ akụ nke zoro ezo,
5mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị
chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.
6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;
nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,
ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,
na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.

9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi
na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị,
ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
11Izuzu zuruoke ga-echebe gị,
nghọta ga na-eche gị nche.

12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie,
sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
13ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke
na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ,
nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ,
jọọkwa njọ.

16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,
na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
17Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,
nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ
nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.
19Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.
Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.

20Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume,
debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,
21nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ,
ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.
22Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ,
ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.
Copyright information for IboBIU